1 Chronicles 3

Ụmụ ndị ikom Devid

1Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn.

Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ.
Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel.
2Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua.
Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit
3Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital.
Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.

4Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii.


Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ.
5Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ:

Shamua,
Shimea bụ ụzọ ọzọ e si akpọ Shamua
Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ.
6Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua,
Elishua ma ọ bụkwanụ Elishama.
Elifelet,
7Noga, Nefeg, Jafia, 8Elishama, Eliada na Elifelet. Ha niile dị itoolu nʼọnụọgụgụ.

9Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Devid, na-agụnyeghị ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara. Tama bụ nwanne ha nwanyị.

Ndị eze Juda

10Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam,
na Abija,
na Asa,
na Jehoshafat,
11na Joram,
Joram ma ọ bụkwanụ Jehoram

na Ahazaya,
na Joash,
12na Amazaya,
na Azaraya,
na Jotam,
13na Ehaz,
na Hezekaya,
na Manase,
14na Amọn,
na Josaya.
15Ụmụ ndị ikom Josaya:
Johanan nwa mbụ ya,
na Jehoiakim nwa ya nke abụọ,
na Zedekaya nwa ya nke atọ,
na Shalum nwa ya nke anọ.
16Ụmụ Jehoiakim bụ ndị a,
Jehoiakin nwa ya,
na Zedekaya.

Ụmụ ụmụ Jehoiakin

17Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jehoiakin, eze ahụ a dọtara nʼagha:
Shealtiel, nwa ya,
18Malkiram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Hoshama na Nedabaya.
19Ụmụ ndị ikom Pedaya bụ
Zerubabel na Shimei.
Ụmụ ndị ikom Zerubabel bụ ndị a:
Meshulam na Hananaya. Shelomit bụ nwanne ha nwanyị.
20E nwekwara ndị ikom ise ọzọ aha ha bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya na Jushab-Hesed.
21Ụmụ Hananaya mụrụ bụ
Pelataya na Jeshaya. Jeshaya mụrụ Refaya; Refaya mụrụ Anan na Ọbadaya, Ọbadaya mụrụ Shekanaya.
22Ụmụ Shekanaya bụ ndị a:
Shemaya na ụmụ ya ndị ikom: Hatush, Igal, Bariya, Nearaya na Shafat. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ.
23Ụmụ Nearaya bụ ndị a,
Elioenai, Hezekaya na Azrikam. Ha dị atọ nʼọnụọgụgụ.
24Ndị Elioenai mụrụ bụ ndị a:
Hodavaya, Eliashib, Pelaya, Akub, Johanan, Delaya na Ananị. Ha niile dị asaa nʼọnụọgụgụ.
Copyright information for IboBIU